1 O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị,
2 Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị,
3 Ndị iro m na-alaghachi azụ,
4 I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi,
5 I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi,
6 Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m,
7 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
8 Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe;
9 Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu.
10 Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi,
11 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn.
12 Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe;
13 O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m!
14 ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị
15 Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru;
16 Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi;
17 Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili;
18 Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa;
19 O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ;
20 O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu;