1 Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?
2 Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,
3 Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,
4 Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,
5 Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;
6 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m.
7 Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,
8 Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,
9 Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,
10 Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya,
11 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola.
12 Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị,
13 Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?
14 Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,
15 Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,
16 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
17 O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;
18 Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,