1 Onyenwe anyị, Chineke, Onye kachasị chi niile,
2 Chineke na-enwupụta dịka ìhè, site na Zayọn,
3 Chineke anyị na-abịa,
4 Ọ na-akpọku eluigwe
5 “Chikọtaranụ m ndị m e doro nsọ,
6 Eluigwe na-ekwupụta ezi omume ya,
7 “Nụrụnụ, ndị m, m ga-ekwukwa,
8 Anaghị m abara unu mba nʼihi ịchụ aja unu,
9 Enweghị m mkpa maka oke ehi unu site nʼụlọ anụmanụ unu
10 nʼihi na ụmụ anụmanụ niile nke oke ọhịa bụ nke m,
11 Amaara m ụmụ nnụnụ niile nọ nʼelu ugwu niile,
12 Ọ bụrụ na agụụ agụọ m, agaghị m agwa gị ya,
13 Ana m ata anụ oke ehi,
14 “Chụọrọ Chineke aja ekele,
15 ma kpọkuo m nʼụbọchị nsogbu gị,
16 Ma Chineke na-agwa ndị na-eme ihe ọjọọ okwu sị,
17 Unu kpọrọ ndụmọdụ m asị,
18 Mgbe unu hụrụ onye ohi, unu na ya na-ejikọta aka;
19 Ọnụ unu na-eme ọsịịsọ ikwu okwu ọjọọ,
20 Unu na-ekwugide ụmụnna unu mgbe niile,
21 Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị;
22 “Tụgharịa uche na nke a, unu ndị na-echefu Chineke,
23 Onye na-eji ekele achụrụ m aja, na-asọpụrụ m,