1 O Chineke, meere m ebere,
2 Sachapụ mmehie m niile,
3 Nʼihi na amaara m njehie m niile,
4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,
5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m;
6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo;
7 Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha;
8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;
9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,
10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,
11 Achụpụla m nʼihu gị,
12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,
13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị,
14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara,
15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m,
16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya.
17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa,
18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu;
19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja,