1 Onyenwe anyị, biko, nụrụ ekpere m
2 Geekwa ntị nʼakwa arịrịọ m,
3 Ụtụtụ ụbọchị niile, O Onyenwe anyị, ị ga-anụ olu m;
4 Ị bụ Chineke, onye ihe ọjọọ ọbụla anaghị atọ ụtọ;
5 Ndị mpako agaghị eguzo
6 Ị ga-ala ndị niile na-agha ụgha nʼiyi;
7 Ma mụ onwe m, aga m abata nʼime ụlọ gị,
8 Onyenwe anyị, biko, duo m nʼime ezi omume gị
9 Obi ha jupụtara nʼechiche ịla nʼiyi,
10 Maa ha ikpe, Chineke.
11 Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;
12 Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume.