1 Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,
2 I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
3 Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
4 Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
5 Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
6 O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
7 Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
8 Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ máá na aloos na akashia;
9 Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
10 Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
11 Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
12 Ada Taịa ga-eji onyinye bịa;
13 Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya;
14 Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị;
15 E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha;
16 Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị;
17 Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile;