1 Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
2 Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
3 Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
4 Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,
5 Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;
6 Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;
7 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
8 Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,
9 Ọ na-eme ka agha kwụsị
10 Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!
11 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;