1 O Chineke, anyị anụla;
2 I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ,
3 Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,
4 Ị bụ eze m na Chineke m,
5 Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị,
6 Atụkwasịghị m obi m nʼụta m,
7 ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ,
8 Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile,
9 Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala;
10 I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga,
11 Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ,
12 I rere ndị gị ọnụ ala,
13 I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị,
14 I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile,
15 Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu,
16 mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị,
17 Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị,
18 Obi anyị ahapụbeghị gị!
19 Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị,
20 Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị,
21 ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya,
22 Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile.
23 O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra?
24 Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị,
25 E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu,
26 Bilie ma nyere anyị aka;