Salmos 18

IBO

1 O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.

2 Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.

3 Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto,

4 Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;

5 Ụdọ nke ili kere m gburugburu,

6 Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;

7 Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,

8 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,

9 O kewara mbara eluigwe, rịdata;

10 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu,

11 O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,

12 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii

13 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ;

14 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,

15 E kpughere ala ala nke oke osimiri,

16 O sitere nʼelu setịpụ aka ya,

17 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,

18 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,

19 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,

20 Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị;

21 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị,

22 Iwu ya niile dị nʼihu m,

23 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,

24 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,

25 Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,

26 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,

27 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,

28 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,

29 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,

30 Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,

31 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?

32 Ọ bụ Chineke na-enye m ike,

33 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;

34 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,

35 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,

36 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,

37 Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;

38 Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.

39 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,

40 I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.

41 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.

42 Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;

43 Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ

44 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,

45 Obi na-ada ha mba;

46 Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m!

47 Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ,

48 onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.

49 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche,

50 Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu;

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado