1 O Onyenwe anyị, aga m eji obi m niile too gị;
2 Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị
3 Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m;
4 O Onyenwe anyị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị,
5 Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke Onyenwe anyị,
6 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya,
7 A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu,
8 Onyenwe anyị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m;