1 O Onyenwe anyị, ị nyochaala m,
2 Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;
3 Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;
4 O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu
5 Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ,
6 Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m,
7 Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị?
8 Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ.
9 Ọ bụrụ na m efepụ nʼisi ụtụtụ dịka nwa nnụnụ, felagaa
10 ọ bụladị nʼebe ahụ ka aka gị ga na-edu m
11 Ọ bụrụ na m asị, “Nʼezie, ọchịchịrị ga-ekpuchi m
12 Ọ bụladị ọchịchịrị agaghị abụ ọchịchịrị nʼebe ị nọ;
13 Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ.
14 Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee;
15 Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ
16 Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla.
17 Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke!
18 Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ,
19 O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi!
20 Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị;
21 O Onyenwe anyị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị,
22 Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ?
23 O Chineke, nyochaa m, mara obi m.
24 Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m,