Provérbios 9

IBO

1 Amamihe ewuola ụlọ ukwu ya

2 O doziela oriri ya nʼusoro,

3 O zipụkwala ndị ozi ya ka ha gaa kpọọ mmadụ niile,

4 “Bịanụ nʼụlọ m, unu ndị niile na-enweghị uche”

5 “Bịanụ, rie nri m,

6 Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ;

7 Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị;

8 Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;

9 Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa,

10 Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,

11 Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo.

12 Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru,

13 Nwanyị dị nzuzu na-eme mkpọtụ,

14 Ọ na-anọ ọdụ nʼọnụ ụzọ ụlọ ya,

15 na-akpọ ndị na-aga nʼụzọ oku,

16 “Ka ndị niile amamihe kọrọ bịa nʼụlọ m.”

17 “Mmiri e zutere nʼohi na-atọ ụtọ,

18 Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado