1 Ọ bụ na amamihe adịghị eti mkpu?
2 Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ,
3 Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile
4 ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị;
5 Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke;
6 Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu;
7 Ọnụ m na-ekwu eziokwu
8 Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma.
9 Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya;
10 Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha
11 Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa.
12 “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta.
13 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.
14 Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m;
15 Site na m ka ndị eze ji achị,
16 Site na m ka ndị eze ji achị
17 Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya.
18 Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ,
19 Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha,
20 Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume,
21 Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba.
22 “Onyenwe anyị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya,
23 Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị;
24 Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri,
25 tupu e kee ugwu ukwu
26 E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa
27 Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya,
28 mgbe o hiwere mbara eluigwe,
29 mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị,
30 Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka.
31 Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ,
32 “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;
33 Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,
34 Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m,
35 nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;
36 Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ;