1 Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya,
2 Debe iwu m ka ị dị ndụ,
3 Kee ha na mkpịsịaka gị,
4 Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya;
5 Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko,
6 Nʼihi na otu ụbọchị,
7 hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche,
8 ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ
9 nʼoge anyasị, dịka chi na-eji,
10 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya.
11 (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.
12 Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;
13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,
14 “Emezuru m nkwa niile m kwere taa,
15 Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,
16 Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m,
17 Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn
18 Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị;
19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ
20 O ji akpa ego juru gaa njem,
21 Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.
22 O sooro nwanyị ahụ dịka ehi
23 nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.
24 Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị,
25 Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị;
26 Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ,
27 Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili,