1 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe,
2 ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru,
3 Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị;
4 Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ,
5 Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta,
6 Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ.
7 Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha,
8 ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị
9 Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ?
10 Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta,
11 ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi,
12 Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya,
13 onye ji iro na-egbu ikuanya ya,
14 Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ,
15 Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede;
16 Ọ dị ụzọ ihe isii Onyenwe anyị kpọrọ asị,
17 Anya dị nganga,
18 Obi na-echepụta nzube ọjọọ;
19 onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri
20 Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu,
21 Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile,
22 Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị;
23 Nʼihi na iwu a bụ oriọna,
24 idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ,
25 Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya,
26 Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta,
27 Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya,
28 Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ
29 Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya;
30 Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi
31 Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa.
32 Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya,
33 A ga-eti ya ezi ihe otiti, a ga-elelikwa ya anya,
34 Nʼihi na di nwanyị ahụ ga-esite nʼekworo wee iwe dị ọkụ;
35 Ọ gaghị anara ihe ọbụla nʼọnọdụ ihe nkwụghachi nʼihi ihe ọjọọ o mere ya.