1 Nwa m, ṅaa ntị nʼokwu amamihe m,
2 Lezie anya, ka i debe izuzu dị iche iche,
3 Nʼihi na egbugbere ọnụ nwanyị na-akwa iko na-atọ ka mmanụ aṅụ,
4 Ma nʼikpeazụ, ọ na-elu ilu dịka oluilu
5 Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ,
6 Nʼihi na ọ dịghị agbaso ụzọ kwesiri ndụ;
7 Ugbu a ụmụ m, geenụ m ntị,
8 Gbaara nwanyị dị otu a ọsọ!
9 ka ị ghara ire ugwu gị nʼebe ndị ọzọ nọ,
10 Ka ndị ọbịa ghara inwe oke oriri nʼelu akụ gị,
11 Ka ị gharakwa ịsụ ude nʼikpeazụ
12 Mgbe ị ga-asị, Lee ka m si kpọọ ịdọ aka na ntị asị!
13 Egeghị m ntị nʼozizi nke ndị nkuzi m
14 Nʼihi na ugbu a, abịaruola m na mbibi
15 Ṅụọ naanị mmiri nke si nʼite mmiri gị;
16 Gịnị mere ị ga-eji kwe ka isi mmiri gị sọọ nʼokporoụzọ,
17 Kwee ka ha bụrụ nke naanị gị,
18 Kwere ka ịbụ nwoke gị bụrụ ngọzị nye gị;
19 Nne anụ nke na-ahụ nʼanya, dịka ele mara mma,
20 Gịnị ka ị na-achọ nʼahụ nwanyị na-akwa iko?
21 Nʼihi na Onyenwe anyị na-ele gị anya,
22 Onye na-emebi iwu na-esite na mmehie ya laa onwe ya nʼiyi;
23 Ọ ga-anwụ nʼihi na ọ nabataghị ịdọ aka na ntị;