Provérbios 4

IBO

1 Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,

2 Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;

3 Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,

4 ọ ziri m ihe, sịkwa m,

5 Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,

6 Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,

7 Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,

8 Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.

9 Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma

10 Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;

11 M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,

12 Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị,

13 Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,

14 Emela dịka ndị na-emebi iwu.

15 Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha;

16 nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ.

17 Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu,

18 Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ,

19 Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị,

20 Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu.

21 Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile;

22 nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha,

23 Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,

24 Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;

25 Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;

26 Leruo ije ụkwụ gị anya,

27 Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado