1 Ilu dị iche iche nke Solomọn:
2 Akụ a kpatara nʼụzọ na-ezighị ezi adịghị aba uru,
3 Onyenwe anyị agaghị ekwe ka onye ezi omume nwụọ nʼagụụ,
4 Aka ndị umengwụ na-eweta ogbenye,
5 Onye na-ekpokọta nʼoge ọkọchị bụ nwa maara ihe,
6 Onye ezi omume na-anata ngọzị,
7 Aha onye ezi omume ka eji enye ngọzị,
8 Onye obi ya maara ihe na-anabata ihe e nyere nʼiwu,
9 Onye ụzọ ya ziri ezi na-aga ije nʼatụghị egwu,
10 Onye ọbụla na-egbu ikuanya na-ebute ihe mwute,
11 Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ,
12 Ịkpọ asị na-akpali esemokwu,
13 Ndị nwere nghọta na-ekwu okwu nwere isi,
14 Onye amamihe na-akpakọba ihe ọmụma,
15 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike,
16 Ụgwọ ọrụ onye ezi omume bụ ndụ,
17 Onye na-ege ntị na ndụmọdụ na-egosi ụzọ nke ndụ,
18 Onye ji egbugbere ọnụ ụgha ekpuchi ịkpọ asị
19 Nʼọtụtụ okwu mmehie adịghị akwụsị
20 Ire nke onye ezi omume bụ ọlaọcha kachasị mma,
21 Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụju ọtụtụ mmadụ afọ,
22 Ngọzị Onyenwe anyị na-eme mmadụ ọgaranya,
23 Ihe na-atọ onye nzuzu ụtọ bụ izube nzube ọjọọ;
24 Ihe ahụ onye na-emebi iwu nʼatụ ụjọ ya ga-abịakwasị ya,
25 Mgbe oke ifufe na-emebi ihe, ndị na-emebi iwu ka ọ na-eburu;
26 Onye umengwụ na-abụ ihe mgbu nye onyenwe ya;
27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-enye ogologo ndụ,
28 Olileanya ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ;
29 Ụzọ Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị na-enweghị ịta ụta,
30 A pụghị iwezuga onye ezi omume,
31 Nʼọnụ onye ezi omume ka mkpụrụ amamihe si abịa,
32 Egbugbere ọnụ onye ezi omume mara ihe na-eweta ihuọma,