Provérbios 31

IBO

1 Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.

2 Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m.

3 Enyela ụmụ nwanyị ike gị,

4 Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya.

5 Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru.

6 Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi,

7 Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha,

8 Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha;

9 Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi.

10 Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya?

11 Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya,

12 Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma.

13 Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi

14 Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya

15 Tupu chi abọzie,

16 Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya.

17 Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya.

18 Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa;

19 Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa;

20 Ọ na-agbasapụ aka

21 Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche

22 Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina,

23 Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo

24 Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu,

25 Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ.

26 Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu

27 Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya,

28 Ụmụ ya na-ebili gọzie ya;

29 Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha,

30 Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge.

31 E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado