Eclesiastes 1

IBO

1 Okwu onye ozizi, nwa Devid, onye bụ eze na Jerusalem.

2 Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu

3 Olee uru mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile

4 Otu ọgbọ laa, ọgbọ ọzọ abịa,

5 Anyanwụ na-awa, na-adakwa,

6 Ifufe na-efe gaa na ndịda;

7 Mmiri dị nʼiyi niile na-asọbanye nʼoke osimiri

8 Ihe niile nọ na-adọgbu onwe ha nʼọrụ;

9 Ihe ọbụla nke dịrịla na mbụ ga-adịkwa ọzọ.

10 Ọ dị ihe enwere ike ikwu sị,

11 Anaghị echeta ndị mgbe ochie,

12 Mụ onwe m bụ onye nkuzi, bụrịị eze Izrel nʼime Jerusalem.

13 Ekpebiri m, were onwe m nye, iji amamihe nnyochapụta ihe m nwere ike ịmata banyere ihe niile a na-eme nʼime ụwa. Olee ụdị ibu arọ bụ nke a, nke Chineke bokwasịrị ụmụ mmadụ?

14 Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.

15 Ihe gbagọrọ agbagọ, apụghị ime ya ka ọ dizie.

16 Echere m nʼime obi m sị, “Lee anya! Aghọọla m onye ukwu, bụrụ onye maara ihe karịa ndị eze niile chịrịla na Jerusalem. Enweela m amamihe nʼebe ọ dị ukwu, babigakwa ụba oke nʼihe ọmụma.”

17 Nʼihi ya, agbalịsiri m ike ịmụta ihe dị iche nʼetiti ihe ọmụma, na ịyị ara na nzuzu. Ma ihe m chọpụtara bụ na ọ baghị uru. Ọ dị ka itufu oge ịchọ ụzọ ijide ifufe.

18 Nʼihi na mgbe amamihe na-aba ụba, mgbe ahụ ka iwe na ọnụma na-ejupụta,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado