1 “Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem,
2 Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’
3 Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ?
4 Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye
5 Aga m ejekwuru ndị ndu,
6 Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ;
7 “Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?
8 Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
9 Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
10 “Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,
11 Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda
12 Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị.
13 Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku,
14 Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
15 Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
16 Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe;
17 Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere.
18 “Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.
19 Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’
20 “Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya,
21 Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche,
22 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị,
23 Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe.
24 Ha adịghị asị onwe ha,
25 Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka.
26 “E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m,
27 Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya,
28 ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ.
29 M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?”
30 “Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke
31 Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha,