Jó 9

IBO

1 Job zara sị:

2 “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.

3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,

4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,

5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,

6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,

7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;

8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe,

9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion

10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,

11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,

12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?

13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,

14 “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,

15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;

16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,

17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,

18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi

19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!

20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;

21 “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị

22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,

23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,

24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,

25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;

26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,

27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,

28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu

29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara,

30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m

31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtị

32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,

33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,

34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,

35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado