1 Job zara sị:
2 “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu.
3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ,
4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara,
5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a,
6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya,
7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha;
8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe,
9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion
10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta,
11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya,
12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya?
13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi,
14 “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ,
15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu;
16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m,
17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m,
18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi
19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu!
20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe;
21 “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị
22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị,
23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede,
24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu,
25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ;
26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,
27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m,
28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu
29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara,
30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m
31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtị
32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya,
33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị,
34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ,
35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu;