Jó 10

IBO

1 “Ike ịdị ndụ agwụla m.

2 Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,

3 Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,

4 Ị nwere anya nke anụ ahụ?

5 Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,

6 Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m

7 Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,

8 “Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.

9 Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.

10 Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi

11 Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,

12 I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,

13 “Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,

14 Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,

15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!

16 Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ

17 I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,

18 “Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?

19 A sịkwarị na amụpụtaghị m

20 Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?

21 tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ

22 Nʼala nke oke ọchịchịrị,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado