1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
2 “Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?
3 Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?
4 Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,
5 Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,
6 Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,
7 “I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke?
8 Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime?
9 Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa,
10 “Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ,
11 Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie,
12 Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe
13 “Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya,
14 ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka,
15 mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị,
16 Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị,
17 Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie,
18 Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;
19 Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,
20 Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada,