1 Mgbe ahụ, Job zara:
2 “Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe,
3 Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu;
4 “Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ,
5 Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya
6 Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ;
7 “Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị,
8 Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị,
9 Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị
10 Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị,
11 Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu,
12 Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye?
13 “Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike,
14 Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ;
15 Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa.
16 Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị;
17 Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha,
18 Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere,
19 Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha,
20 Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi,
21 Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị,
22 Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị
23 Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi;
24 Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha,
25 Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè.