1 “Anya m abụọ ahụla ihe ndị a niile,
2 Mụ onwe m makwa ihe unu maara;
3 Ma ọ bụ Onye pụrụ ime ihe niile ka m chọrọ ịgwa okwu,
4 Ma otu ọ dị, unu ji okwu ụgha etechi m dịka ọ bụ mgba ụlọ;
5 Ọ bụrụ nnọọ na unu ga-agba nkịtị,
6 Ugbu a, nụrụnụ ịrụ ụka m;
7 Unu ga-ekpelara Chineke ikpe mmegide?
8 Unu ga-egosi ya na unu na-ekpelara ya ikpe?
9 Ọ ga-adịrị unu mma ma ọ bụrụ na o nyochaa unu?
10 Ọ ghaghị ịbara unu mba
11 Ọ ga-abụ na ebube na ịdị ukwuu ya adịghị eme ka unu maa jijiji?
12 Okwu amamihe unu niile dịka ilu nke ntụ;
13 “Nọọnụ jụụ ka m kwuo okwu;
14 Nʼihi gịnị ka m ga-eji tinye onwe m na nsogbu,
15 A sịkwarị na ọ ga-etigbu m aghaghị m ịtụkwasị ya obi m.
16 Nʼezie, nke a ga-aghọrọ m nzọpụta
17 Geenụ ntị nke ọma nʼokwu m.
18 Ugbu a, edoziela m ikpe m nʼusoro,
19 Ọ dị onye pụrụ ibo m ebubo?
20 “Meere m naanị ihe abụọ ndị a, O Chineke,
21 Wepụ aka gị i ji emegide m, meekwa ka ha dị anya nʼebe m nọ.
22 Mgbe ahụ, kpọọ m oku, aga m azakwa gị.
23 Ole ka ha dị bụ mmejọ na mmehie m mere?
24 Gịnị mere i ji gbakụta m azụ?
25 Ị ga-enye ahịhịa ikuku na-ebugharị ntaramahụhụ?
26 Nʼihi na ị na-edetu ihe ndị dị ilu megide m,
27 Ị na-eji mkpọrọ igwe kegide ụkwụ m abụọ;
28 “Ya mere, mmadụ nʼala nʼiyi dịka ihe rere ere,