1 “Mmadụ nke nwanyị mụrụ
2 Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya,
3 Ị na-elegide onye dị otu a anya?
4 Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha?
5 Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ;
6 Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya
7 “Ma olileanya dịịrị osisi;
8 A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala,
9 mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya,
10 Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya;
11 Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata,
12 otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ;
13 “A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ,
14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?
15 Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị,
16 Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ,
17 A ga-ekechi njehie m nʼakpa,
18 “Ma dịka ugwu si erichasi daa,
19 dịka mmiri si akwọchasị nkume,
20 Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga;
21 Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a;
22 Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama