1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
2 “A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m
3 Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri,
4 Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m;
5 Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata,
6 A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu,
7 A jụrụ m ịmetụ ya aka,
8 “O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,
9 Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m
10 Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,
11 “Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?
12 Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?
13 Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka,
14 “Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ
15 Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha,
16 nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi,
17 Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị,
18 Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha.
19 Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri,
20 Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi,
21 Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru,
22 O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m,
23 gbapụtanụ m nʼaka ndị iro,
24 “Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ,
25 Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi!
26 Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m?
27 Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna,
28 “Lezie m anya nke ọma,
29 Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi,
30 Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta?