1 Onyenwe anyị zara Job sị:
2 “Onye ahụ na-arụso Onye pụrụ ime ihe niile ụka ọ pụrụ ịdọ ya aka na ntị?
3 Mgbe ahụ, Job zaghachiri Onyenwe anyị sị:
4 “Abụ m onye na-erughị eru. Oleekwanụ ka m ga-esi zaghachi gị?
5 Ekwuola m mbụ, ma enweghị m ọsịsa ọzọ
6 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
7 “Kwadoo onwe gị dịka dimkpa;
8 “Ị ga-aga nʼihu ikwujọ ikpe ziri ezi m?
9 Ogwe aka gị ọ dị ike dịka nke Chineke?
10 Were ebube na ịdị ukwuu chọọ onwe gị mma,
11 Wụsa iwe gị dị ọkụ nʼebe ndị mpako niile nọ,
12 lekwasịkwa ndị mpako niile anya mee ha ihe ihere,
13 Likọta ha niile nʼotu nʼaja,
14 Mgbe ahụ, mụ onwe m ga-ekwenyere gị,
15 “Lee enyi mmiri anya,
16 Lee ike dị nʼukwu ya,
17 Ọdụdụ ya ka ọ na-efegharị dịka osisi sida;
18 Ọkpụkpụ ya niile dịka ogidi bronz nwere ụmị,
19 Ya onwe ya bụ otu nʼime ọrụ aka mbụ nke Chineke,
20 Ugwu na-enye ya ihe ọ na-eri.
21 Ọ na-edina nʼokpuru ahịhịa na-eto nʼakụkụ mmiri,
22 Ahịhịa lotus na-eji ndo ya kpuchie ya,
23 Ọ bụladị mgbe ebili mmiri na-ama, ọ dịghị atụ egwu;
24 Onye pụrụ ijide ya mgbe ọ na-ele anya,