Jó 41

IBO

1 “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan

2 Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya

3 Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?

4 Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ

5 Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?

6 Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?

7 Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya

8 Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka,

9 Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya.

10 Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe.

11 Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ?

12 “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan,

13 Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ?

14 Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya,

15 Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro

16 nke ọbụla dị ibe ya nso,

17 E jikọtara ha ọnụ nke ọma,

18 Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;

19 Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,

20 Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,

21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.

22 Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,

23 Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma,

24 Obi ya dị ike dịka nkume,

25 Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ;

26 O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya,

27 Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa;

28 Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga,

29 Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka,

30 Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ,

31 Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite;

32 Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga;

33 O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya,

34 Ọ na-eleda ndị mpako niile anya.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado