1 “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan
2 Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya
3 Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere?
4 Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ
5 Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ?
6 Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa?
7 Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya
8 Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka,
9 Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya.
10 Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe.
11 Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ?
12 “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan,
13 Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ?
14 Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya,
15 Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro
16 nke ọbụla dị ibe ya nso,
17 E jikọtara ha ọnụ nke ọma,
18 Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere;
19 Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya,
20 Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta,
21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku.
22 Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya,
23 Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma,
24 Obi ya dị ike dịka nkume,
25 Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ;
26 O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya,
27 Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa;
28 Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga,
29 Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka,
30 Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ,
31 Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite;
32 Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga;
33 O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya,
34 Ọ na-eleda ndị mpako niile anya.