Jó 39

IBO

1 “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?

2 Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha.

3 Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha.

4 Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike.

5 “Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?

6 Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha,

7 Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,

8 Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,

9 “Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?

10 Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị?

11 Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne?

12 I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka

13 “Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,

14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala

15 Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha

16 Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,

17 Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe

18 Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ,

19 “Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya,

20 Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube,

21 Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,

22 Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya;

23 Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,

24 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.

25 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’

26 “Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu,

27 Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu

28 Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị;

29 O bụ site nʼebe ahụ

30 Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado