1 “Ị maara mgbe ewu ọhịa bi nʼelu ugwu ji amụ nwa?
2 Ị na-agụkọ ọnwa ole afọ ime ha na-adị tupu ha amụọ nwa ha.
3 Ha na-amakpuru ala mụpụta nwa ha.
4 Ụmụ ha na-eto nʼọhịa gbasiekwa ike.
5 “Onye na-eme ka ịnyịnya ibu ọhịa nwere onwe ya?
6 Nke m nyere ala ihe na-adịghị ka ọ bụrụ ebe obibi ha,
7 Ụzụ dị nʼobodo adịghị emetụta ya,
8 Elu ugwu niile bụ ebe ịkpa nri ya,
9 “Ị nwere ike ime ka atụ jeere gị ozi?
10 Ị nwere ike ime ka atụ rụọra gị ọrụ nʼubi gị?
11 Ị ga-atụkwasị ya obi nʼihi na ike ya hiri nne?
12 I nwere ike ịtụkwasị ya obi ka o gaa bulatara gị ọka
13 “Enyi nnụnụ na-eji ọṅụ gbasapụ nku ya,
14 Ọ na-eyi akwa ya nʼala
15 Ọ naghị emetụ ya nʼobi na ụkwụ nwere ike ịzọpịa ha
16 Ọ na-emeso ụmụ ya ihe ike dịka a ga-asị na ha abụghị nke ya,
17 Nʼihi na Chineke ekenyeghị ya amamihe
18 Ma ọ na-agbalite ọsọ. Mgbe ọbụla ọ gbasara nku ya ịgba ọsọ,
19 “Ọ bụ gị na-enye ịnyịnya ike ya,
20 Ị na-eme ya ka ọ wụgharịa dịka igurube,
21 Ọ na-azọ ụkwụ gam gam nʼala, ọ na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ike ya,
22 Ọ na-achị ihe egwu ọchị, ụjọ ọbụla anaghị atụ ya;
23 Akpa àkụ na-ayọgharị nʼakụkụ ya,
24 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eripịa ala.
25 Mgbe ụzụ agha bara ya nʼisi, ọ na-eti mkpu sị, ‘Ahaa!’
26 “Ọ bụ site nʼamamihe gị ka egbe ji efego nʼelu,
27 Ọ bụ gị nyere ugo iwu ifeli elu
28 Nʼelu nkume dị elu ka ọ na-ebi nọọkwa ọnọdụ abalị;
29 O bụ site nʼebe ahụ
30 Ụmụ ya na-amịchakwa ọbara,