1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sitere nʼoke ifufe gwa Job okwu sị:
2 “Onye bụ onye a nke ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya
3 Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa
4 “Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?
5 Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara,
6 Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya,
7 Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ,
8 “Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe
9 mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe,
10 mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị,
11 mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya,
12 “O nweela oge i nyere ụtụtụ iwu,
13 ka o jide akụkụ niile nke ụwa aka
14 Ụwa na-ewere ụdịdị ya dịka ụrọ a kakwasịrị akara;
15 A na-eme ka ndị na-emebi iwu ghara inwe ìhè,
16 “I jeruola nʼisi iyi mmiri dị nʼosimiri,
17 O nweela onye gosiri gị ọnụ ụzọ ọnwụ?
18 Ị ghọtara ịdị ukwu nke ụwa na otu o si gbasapụ?
19 “Olee ụzọ e si aga ebe ìhè bi?
20 Ị nwere ike iduru ha jee nʼebe ha bi?
21 Nʼezie ị maara, nʼihi na a mụọla gị tupu e kee ihe ndị a!
22 “Ị banyela nʼụlọ niile ebe a na-achịkọba snoo,
23 nke m chekwara nye oge nsogbu,
24 Kedụ ụzọ e si ejeru ebe a na-anọ ekesasị amụma egbe eluigwe,
25 Onye wara ụzọ maka oke mmiri ozuzo,
26 Si otu a mee ka mmiri zokwasị ebe mmadụ na-ebighị,
27 ka mmiri ozuzo mee ka ala kpọrọ nkụ nweta mmiri
28 Mmiri ozuzo o nwere nna?
29 Site nʼakpanwa onye ka mkpụrụ mmiri si apụta?
30 nke na-eme ka mmiri kpụkọtaa dịrị ike dịka nkume,
31 “Ị pụrụ ikechi agbụ niile nke Pleiades?
32 Ị pụrụ ime ka igwe kpakpando pụta nʼoge ha
33 Ị maara iwu na-achị ihe niile dị na mbara eluigwe?
34 “Ị pụrụ iti mkpu ruo igwe ojii
35 Ị pụrụ izipụ amụma egbe eluigwe nʼụzọ ha?
36 Onye na-etinye amamihe nʼobi mmadụ,
37 Onye nwere amamihe ịgụ igwe ojii niile dị na mbara eluigwe ọnụ?
38 mgbe aja dị nʼala siri ike,
39 “Ọ bụ gị na-achụtara nne ọdụm ihe oriri,
40 mgbe ha makpuuru nʼime ọgba ha,
41 Onye na-edoziri ugolọma ihe oriri ya,