1 “Nʼihi nke a, obi m na-ama jijiji,
2 Gee ntị! Gee ntị nụrụ ụda olu ya,
3 Ọ na-atọpụ amụma ya ka ọ na-ejeru nʼokpuru eluigwe niile,
4 Nke a gasịa, ihe ọzọ na-eso ya bụ mbigbọ nke olu ike ya;
5 Nʼụzọ dị ebube ka olu Chineke si ada dịka egbe eluigwe;
6 Nʼihi na ọ bụ ya na-agwa snoo okwu sị: ‘Daa nʼelu ala,’
7 Ka mmadụ o kere mata akaọrụ ya;
8 Ụmụ anụmanụ bi nʼọhịa na-agbaba zoo onwe;
9 Oke ifufe na-esite nʼụlọ ya na-abịa,
10 Iku ume Chineke na-emepụta mkpụrụ mmiri,
11 Ọ na-eme ka igwe ojii jupụta na mmiri;
12 Site na ntụziaka ya ka ha na-echigharị onwe ha gburugburu
13 Ọ na-ewebata igwe ojii maka ịta ndị mmadụ ahụhụ,
14 “Job, gee ntị.
15 Ị maara otu Chineke si achịkọta igwe ojii
16 Ị maara otu Chineke si kwụba igwe ojii na mbara eluigwe,
17 Gị onye uwe i yi nʼahụ na-ekpo gị ọkụ
18 ị pụrụ iso ya tụsaa mbara eluigwe
19 “Gwa anyị ihe anyị ga-azaghachi ya;
20 A ga-agwa ya na m nwere okwu?
21 Ugbu a, ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ilekwasị anyanwụ anya
22 Nʼugwu ka ebube na-enwu dịka ọlaedo si apụta;
23 Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye anyị na-enweghị ike chọta. Ike ya dị ukwuu,
24 Ya mere, ụmụ mmadụ na-atụ egwu ya,