1 Elihu gara nʼihu sị:
2 “Nyetụ m nwa oge nta, ka m gosi gị
3 Ana m enweta amamihe m site nʼebe dị anya;
4 Ya doo gị anya na okwu m abụghị okwu ụgha;
5 “Chineke dị ike ma ọ dịghị eleda mmadụ ọbụla anya;
6 Ọ naghị edebe ndị ajọ omume ndụ,
7 Ọ dịghị ewepụ anya ya nʼebe ndị ezi omume nọ,
8 Ma ọ bụrụ na e kechie ụmụ mmadụ nʼagbụ igwe,
9 ọ na-agwa ha ihe ha mere,
10 Ọ na-eme ka ha ṅaa ntị nye ntụziaka,
11 Ọ bụrụ na ha erube isi, jekwaara ya ozi,
12 Ma ọ bụrụ na ha egeghị ntị,
13 “Ndị ajọ omume na-ebu iro nʼobi ha.
14 Ha na-anwụ nʼoge okorobịa ha,
15 Ma ndị na-ahụsị anya ka ọ na-azọpụta site nʼahụhụ ha;
16 “Ọ na-achọsi ike ịnapụta gị site nʼọnụ mkpagbu,
17 Ma ugbu a, ikpe ọmụma dịịrị ndị ajọ omume na-anyịgbu gị;
18 Lezie anya ka mmadụ ọbụla ghara iji akụnụba rafuo gị;
19 Akụnụba gị maọbụ ịdị ike gị ha pụrụ ịnapụta gị
20 Anọla na-echere ka abalị bịa,
21 Lezie anya, ka i ghara iche ihu nye ajọ ihe,
22 “E buliela Chineke elu nʼike ya,
23 Onye họpụtaara ya ụzọ ọ ga-agbaso,
24 Cheta ka i bulie ọrụ aka ya elu,
25 Mmadụ niile ahụzuola ya;
26 Lee, Chineke dị ukwuu, karịa nghọta anyị.
27 “Ọ bụ ya na-eme ka ukuru mmiri rigoro nʼelu mgbe anwụ na-acha,
28 Igwe ojii na-awụdata mmiri dị nʼime ya
29 Onye pụrụ ịghọta ka o si gbasaa igwe ojii,
30 Lee, ọ gbasaala amụma ya gburugburu ya
31 Nke a bụ ụzọ o si achị mba niile
32 O ji amụma nke egbe eluigwe kpojuo aka ya,
33 Ịda ụda nke egbe eluigwe na-akọwa ọbịbịa nke oke ifufe mmiri;