1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:
2 “Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?
3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,
4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,
5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;
6 Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,
7 “Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?
8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka
9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.
10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,
11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,
12 “E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,
13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,
14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,
15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.
16 Ọ kwụsịrị;
17 ‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?
18 Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,
19 ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,
20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:
21 Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,