Jó 4

IBO

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:

2 “Iwe ọ ga-ewe gị ma ọ bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?

3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,

4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,

5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;

6 Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,

7 “Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?

8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka

9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume ọ na-ekupụta.

10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,

11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe ọ dọgbutara,

12 “E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,

13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,

14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,

15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.

16 Ọ kwụsịrị;

17 ‘Mmadụ efu ọ nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?

18 Ọ bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,

19 ọ ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,

20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:

21 Ọ bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado