1 Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.
2 Job sịrị:
3 “Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi;
4 Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị:
5 Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya,
6 Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya,
7 Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu,
8 Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ,
9 Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị,
10 nʼihi na o mechighị akpanwa nne m,
11 “Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m,
12 Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m?
13 Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo;
14 mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa,
15 mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo,
16 Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo,
17 Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara,
18 Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha,
19 Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ;
20 “Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè?
21 Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa,
22 ndị jupụtara nʼọṅụ,
23 Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ;
24 Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị;
25 Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m,
26 Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ,