Jó 3

IBO

1 Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.

2 Job sịrị:

3 “Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi;

4 Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị:

5 Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya,

6 Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya,

7 Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu,

8 Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ,

9 Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị,

10 nʼihi na o mechighị akpanwa nne m,

11 “Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m,

12 Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m?

13 Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo;

14 mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa,

15 mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo,

16 Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo,

17 Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara,

18 Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha,

19 Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ;

20 “Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè?

21 Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa,

22 ndị jupụtara nʼọṅụ,

23 Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ;

24 Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị;

25 Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m,

26 Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado