1 Mgbe ahụ Elihu sịrị:
2 “Nụrụ okwu m, unu ndị amamihe;
3 Ntị na-anwale okwu dịka
4 Ka anyị chọpụtara onwe anyị ihe ziri ezi;
5 “Job na-asị, ‘Abụ m onye ezi omume,
6 Ọ bụ eziokwu na aka m dị ọcha
7 Olee nwoke dịka Job,
8 Ya na ndị na-eme ajọ ihe bụ enyi,
9 Nʼihi na ọ na-asị, ‘Ọ dịghị uru dị ya
10 “Ya mere, geenụ m ntị, unu ndị ikom nwere nghọta.
11 Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị,
12 Ọ bụ ihe a na-ekwesighị iche nʼuche na Chineke pụrụ ime ihe na-ezighị ezi,
13 Onye họpụtara ya ịchị ụwa?
14 Ọ bụrụ na ọ bụ ebumnuche ya
15 mmadụ niile ga-alakọta nʼiyi,
16 “Ọ bụrụ na i nwere nghọta, nụrụ nke a;
17 Ọ pụrụ ịchị bụ onye ahụ kpọrọ ikpe ziri ezi asị?
18 Ọ bụghị ya na-agwa ndị eze okwu sị, ‘Unu abaghị uru,’
19 Onye na-adịghị ekpe ikpe mmegide nye ụmụ ndị ikom eze,
20 Nʼotu ntabi anya, ha na-anwụ nʼime etiti abalị;
21 “Anya ya na-elekwasị ụzọ niile nke ụmụ mmadụ;
22 Ọ dịghị ọchịchịrị dị, ọ dịghịkwa oke ọchịchịrị dị,
23 Ọ dịghị mkpa ọ dịịrị Chineke ịga nʼihu inyocha ụmụ mmadụ,
24 Na-ajụghị ajụjụ Chineke na-akụtu ndị a maara aha ha
25 Nʼihi na ọ na-agụkọ ọrụ ha niile,
26 Nʼebe mmadụ niile ga-ahụ ha ka ọ na-ata ha ahụhụ
27 nʼihi na ha sitere nʼiso ya wezuga onwe ha,
28 Ha mere ka iti mkpu akwa nke ndị ogbenye ruo ya ntị,
29 Ma ọ bụrụ na ọ gba nkịtị, onye ga-ama ya ikpe?
30 igbochi nwoke na-adịghị atụ egwu Chineke ịchị obodo,
31 “Ọ bụrụ na mmadụ a sị Chineke,
32 Biko, zi m ihe ndị ahụ m na-apụghị ịhụ;
33 Chineke ọ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ site na mkpebi gị
34 “Ndị ikom ndị nwere nghọta na-ekwu si,
35 ‘Job na-ekwu okwu dịka onye na-amaghị ihe;
36 Ọ ga-adị nnọọ mma ma a sị na a nwaa Job ruo nsọtụ
37 Ọ na-atụkwasị nnupu isi nʼelu mmehie ya;