1 “Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;
2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;
3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;
4 Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,
5 Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;
6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;
7 Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,
8 “Ma ị kwuola ya na ntị m,
9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;
10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;
11 Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;
12 “Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,
13 Gịnị mere i ji na-ekpesara ya
14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,
15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,
16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntị
17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,
18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,
19 “Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,
20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,
21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,
22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,
23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,
24 ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,
25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,
26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,
27 Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:
28 ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,
29 “Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụ
30 Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,
31 “Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;
32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m;
33 Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị;