1 “Ma ugbu a, ha na-akwa m emo
2 Uru gịnị ka ike aka ha ga-abara m,
3 Ha bụ ndị ike gwụrụ site nʼụkọ na agụụ,
4 Nʼala ọhịa ka ha na-atụrị ahịhịa nnu,
5 A chụpụrụ ha site nʼetiti ndị mmadụ ibe ha,
6 A chụpụrụ ha ka ha gaa biri nʼala iyi mmiri na-adịghị.
7 Ha na-eme ụzụ nʼọhịa dịka ụmụ anụmanụ,
8 Ha bụ ndị e ledara anya, ndị na-enweghị aha,
9 “Ma ugbu a, abụrụla m ihe ụmụ okorobịa ji abụ abụ ịkwa emo;
10 Abụ m ihe ịsọ oyi nye ha, ha adịghị abịakwa m nso;
11 Ma ugbu a, ebe ọ bụ na Chineke atọpụla eriri ụta m ma kpagbuo m,
12 Nʼaka nri m mba ndị a na-ebuso m agha.
13 Ha na-etiwasị ụzọ m,
14 Ha na-abịakwasị m dịka ndị sitere ebe e tipuru mgbidi;
15 Oke egwu abịakwasịla m;
16 “Ugbu a, ndụ m ji nwayọọ nwayọọ na-agabiga;
17 Abalị na-esewasị ọkpụkpụ m,
18 Nʼoke ike ya, Chineke na-adịrị m ka uwe;
19 Ọ na-atụba m nʼime apịtị,
20 “Chineke m, anam etiku gị ma ị dịghị aza m;
21 Ị na-emegide m na-enweghị obi ebere;
22 Ị na-ejide m nʼike welie m elu chụba m nʼoke ifufe,
23 Amara m na ị ga-eweda m ruo ọnwụ;
24 “Nʼezie, ọ dịghị onye na-emegide onye e tidara nʼala;
25 Ọ bụ na m akwaghị akwa nʼihi ndị nọ na nsogbu;
26 Ma mgbe m lere anya ihe ọma, ihe ọjọọ bịara;
27 Obi m anaghị ezu ike nʼime m;
28 Ana m agagharị na-eji nji ma ọ bụghị nʼihi oke anwụ.
29 Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa;
30 Akpụkpọ ahụ m na-eji nji na-ekpe iwere;
31 Ụda ụbọ akwara m bụ ụda iru ụjụ;