1 Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
2 “Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga,
3 mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi
4 Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma,
5 mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m
6 mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,
7 “Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo
8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha,
9 ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu
10 olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ,
11 Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m,
12 Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka,
13 Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m;
14 Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe,
15 Abụ m anya nye onye ìsì,
16 Abụ m nna nke onye nọ na mkpa;
17 Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume,
18 “Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m,
19 Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri,
20 Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m,
21 “Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị,
22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ.
23 Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo,
24 Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya;
25 Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha;