1 Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
2 “Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!
3 Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!
4 Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?
5 “Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,
6 Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;
7 Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.
8 Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,
9 Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,
10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,
11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,
12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;
13 Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;
14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;