1 Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
2 “Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi,
3 Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m,
4 egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ,
5 Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi;
6 Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya;
7 “Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume,
8 Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya,
9 Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya
10 Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile?
11 “Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke;
12 Unu onwe unu ahụla ihe ndị a,
13 “Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume,
14 Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha;
15 Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ;
16 Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu,
17 ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha,
18 Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla,
19 Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ;
20 Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri;
21 Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ;
22 Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere
23 Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo,