1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:
2 “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke;
3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ?
4 Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke?
5 Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta,
6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru,