1 “Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe?
2 Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala,
3 Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei,
4 Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa.
5 Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara,
6 Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi,
7 Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị,
8 Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ,
9 Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara.
10 Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị,
11 Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya,
12 Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili,
13 “Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè,
14 Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili,
15 Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji;
16 Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa,
17 Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha,
18 “Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri;
19 Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee,
20 Akpanwa na-echefu ha,
21 Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa,
22 Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ,
23 Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha,
24 A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị,
25 “Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha