1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
2 “Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu;
3 A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya;
4 Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya
5 Aga m achọpụta ihe o ga-aza m
6 Ọ ga-eji ike dị egwu megide m?
7 Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.
8 “Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;
9 Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,
10 Ma ọ maara ụzọ m na-aga,
11 ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;
12 Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m;
13 “Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?
14 Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,
15 Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;
16 Chineke emeela ka obi m daa mba;
17 Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,