1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
2 “Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
3 O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume?
4 “Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo
5 Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu?
6 Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu;
7 I nyeghị ndị ike gwuru mmiri,
8 Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala,
9 Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha,
10 Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu,
11 Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ,
12 “Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe?
13 Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara?
14 Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị
15 Ị ga-agbaso ụzọ ochie
16 E bupụrụ ha tupu oge ha eruo.
17 Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka!
18 Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha,
19 Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa;
20 ‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị,
21 “Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo,
22 Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ,
23 Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị;
24 tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja,
25 Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo,
26 Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ,
27 Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị,
28 Ihe i kpebiri ga-emezukwa,
29 Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’
30 Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha,