1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
2 “Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi
3 Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,
4 “Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,
5 Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,
6 Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,
7 ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;
8 Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,
9 Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,
10 Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;
11 Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa
12 “Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,
13 ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,
14 ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,
15 Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;
16 Ọ ga-amịcha elo agwọ,
17 Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,
18 Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.
19 Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,
20 “Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;
21 Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,
22 Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,
23 Mgbe o rijuru afọ
24 Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,
25 Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,
26 Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,
27 Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya
28 Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;
29 Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,