Jó 20

IBO

1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2 “Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi

3 Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,

4 “Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,

5 Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,

6 Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,

7 ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;

8 Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,

9 Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,

10 Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;

11 Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa

12 “Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,

13 ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,

14 ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,

15 Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;

16 Ọ ga-amịcha elo agwọ,

17 Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,

18 Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.

19 Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,

20 “Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;

21 Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,

22 Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,

23 Mgbe o rijuru afọ

24 Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,

25 Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,

26 Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,

27 Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya

28 Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;

29 Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado