1 Job zara sị:
2 “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ?
3 Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m,
4 A sịkwarị na m bụ onye mmehie,
5 Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m,
6 mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m,
7 “Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata;
8 Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe;
9 O yipụla m ugwu m,
10 Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara;
11 Iwe ya dị ọkụ megide m;
12 Ndị agha ya ji ike na-abịa;
13 “O meela ka ụmụnne m
14 Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m;
15 Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ;
16 Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m,
17 Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide;
18 Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo;
19 Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ;
20 Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ;
21 “Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere,
22 Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m?
23 “Ọ gaara atọ m ụtọ
24 na e ji mkpisi igwe dee ha,
25 Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ,
26 Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m,
27 Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya,
28 “Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya
29 unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha;