1 Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:
2 “Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu?
3 Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa,
4 Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị,
5 “A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu;
6 ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị,
7 Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya;
8 Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya;
9 Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya,
10 E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala,
11 Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile,
12 Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike;
13 Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya;
14 Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya
15 Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya;
16 Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala,
17 A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ,
18 A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị,
19 O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya,
20 Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya;
21 Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị,