Joel 3

IBO

1 “Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ,

2 na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa,

3 Ha fere nza nʼihi ndị m,

4 “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.

5 Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu.

6 Unu refuru ndị Juda na ndị Jerusalem, resi ha ndị Griik, si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha.

7 “Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi.

8 Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị Juda, ndị ga-eresi ha ndị Sheba, bụ mba tere anya.” Onyenwe anyị ekwuola ya.

9 Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile:

10 Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha,

11 Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile.

12 “Ka akpọlitekwa mba niile,

13 Tinye mma iwe ihe ubi,

14 Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ!

15 Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji,

16 Onyenwe anyị ga-ebigbọ na Zayọn,

17 “Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu

18 “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị,

19 Ma Ijipt ga-atọgbọrọ nʼefu,

20 Ma Juda ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.

21 Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha?

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado